7 M ga-akpọta unu n’ebe m nọ dị ka otu ndị,+ m ga-egosikwa na mụ onwe m bụ Chineke unu;+ unu ga-amara na mụ onwe m bụ Jehova bụ́ Chineke unu onye na-akpọpụta unu n’ibu arọ Ijipt.+
14 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị na-ejegharị n’ebe ị mara ụlọikwuu ịnapụta gị+ na inyefe ndị iro gị n’aka gị;+ ebe ị mara ụlọikwuu ga-adịkwa nsọ,+ ka o wee ghara ịhụ ihe ọ bụla na-ekwesịghị ekwesị n’ahụ́ gị wee kwụsị iso gị.+
16 Oleekwa nkwekọrịta ụlọ nsọ Chineke na arụsị nwere?+ N’ihi na anyị bụ ụlọ nsọ+ nke Chineke dị ndụ; dị nnọọ ka Chineke kwuru, sị: “M ga-ebi n’etiti ha,+ na-ejegharịkwa n’etiti ha, m ga-abụkwa Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m.”+