48 Ị ga na-ejere ndị iro gị, bụ́ ndị Jehova ga-ezite ibuso gị agha, ozi.+ Agụụ ga na-agụ gị,+ akpịrị ga na-akpọ gị nkụ, ị ga-agbakwa ọtọ ma nọrọ n’ụkọ ihe niile mgbe ị na-ejere ha ozi; ọ ga-anyawakwa gị yok ígwè n’olu ruo mgbe ọ lara gị n’iyi.+
17 Ọ ga-erukwa na ọ bụ ndị niile ahụ chere ihu ịbanye Ijipt ka ha biri n’ime ya dị ka ndị ọbịa ka mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-egbu;+ ọ dịghị onye ga-alanahụ ma ọ bụ gbapụ n’ime ha, n’ihi ọdachi ahụ m ga-eme ka ọ dakwasị ha.”’+