Jeremaya
42 Ndị ọchịagha niile ahụ na Johenan+ nwa Kariya na Jezanaya+ nwa Hoshaya+ na ndị niile ahụ, malite n’onye kasị nta ruo n’onye kasị ukwuu, wee bịa 2 gwa Jeremaya onye amụma, sị: “Biko, nụrụ arịrịọ anyị na-arịọ ka i meere anyị amara. Kpekuo Jehova bụ́ Chineke gị ekpere n’ihi anyị,+ n’ihi ndị a niile fọdụrụ, n’ihi na ọ bụ anyị fọdụrụ, naanị mmadụ ole na ole n’ime ọtụtụ ndị,+ dị nnọọ ka i ji anya gị na-ahụ anyị. 3 Ka Jehova bụ́ Chineke gị gwa anyị ụzọ anyị kwesịrị ije ije na ya na ihe anyị kwesịrị ime.”+
4 Jeremaya onye amụma wee sị ha: “Anụla m. Lee, m ga-ekpeku Jehova bụ́ Chineke unu ekpere dị ka unu kwuru;+ ọ ga-erukwa na ihe ọ bụla Jehova zara unu, m ga-agwa ya unu.+ Ọ dịghị okwu ọ bụla m ga-ahapụ ịgwa unu.”+
5 Ha wee sị Jeremaya: “Ka Jehova bụrụ ezi onye akaebe kwesịrị ntụkwasị obi megide anyị+ ma ọ bụrụ na anyị emeghị kpọmkwem ihe ọ bụla Jehova bụ́ Chineke gị ziri gị ka ị gwa anyị.+ 6 Ma ọ̀ dị mma ma ọ dị njọ, anyị ga-erube isi n’ihe Jehova bụ́ Chineke anyị kwuru, bụ́ onye anyị na-ezi gị ka ị gakwuru, ka ihe wee gaziere anyị n’ihi na anyị rubere isi n’ihe Jehova bụ́ Chineke anyị kwuru.”+
7 O wee ruo mgbe ụbọchị iri gasịrị na okwu Jehova ruru Jeremaya ntị.+ 8 O wee kpọkọta Johenan nwa Kariya na ndị ọchịagha niile bụ́ ndị ya na ha nọ nakwa mmadụ niile, malite n’onye kasị nta ruo ọbụna n’onye kasị ukwuu;+ 9 o wee sị ha: “Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, bụ́ onye unu ziri m ka m mee ka ọ nụrụ arịrịọ unu na-arịọ ka o meere unu amara,+ 10 ‘Ọ bụrụ na unu ebiri n’ala a,+ m ga-ewu unu dị ka ụlọ, agaghị m etida unu, m ga-akụkwa unu dị ka mkpụrụ, agaghị m efopụ unu;+ n’ihi na m ga-agbanwe obi m n’ọdachi m mere ka ọ dakwasị unu.+ 11 Unu atụla egwu n’ihi eze Babịlọn, bụ́ onye unu na-atụ egwu.’+
“‘Unu atụla egwu n’ihi ya,’+ ka Jehova kwuru, ‘n’ihi na m nọnyeere unu, iji zọpụta unu ma napụta unu n’aka ya.+ 12 M ga-emere unu ebere, ọ ga-emekwara unu ebere, meekwa ka unu laghachi n’ala unu.+
13 “‘Ma ọ bụrụ na unu na-asị: “Ee e; anyị agaghị ebi n’ala a!” ka unu wee nupụ isi n’ihe Jehova bụ́ Chineke unu kwuru,+ 14 wee sị: “Ee e, kama ọ bụ n’ala Ijipt ka anyị ga-aga biri,+ bụ́ ebe anyị na-agaghị ahụ agha, ebe anyị na-agaghịkwa anụ ụda opi, ebe agụụ nri na-agaghịkwa agụ anyị; ọ bụ ebe ahụ ka anyị ga-ebi”;+ 15 ya mere, unu ndị Juda fọdụrụnụ, nụrụnụ ihe Jehova kwuru. Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “Ọ bụrụ na unu echee ihu ka unu banye Ijipt, unu ewee banye biri n’ime ya dị ka ndị ọbịa,+ 16 mma agha ahụ unu na-atụ egwu ga-enweta unu n’ebe ahụ n’ala Ijipt,+ ụnwụ ahụ unu na-atụ ụjọ ya ga-esoro unu n’azụ banye Ijipt;+ ọ bụkwa n’ebe ahụ ka unu ga-anwụ.+ 17 Ọ ga-erukwa na ọ bụ ndị niile ahụ chere ihu ịbanye Ijipt ka ha biri n’ime ya dị ka ndị ọbịa ka mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-egbu;+ ọ dịghị onye ga-alanahụ ma ọ bụ gbapụ n’ime ha, n’ihi ọdachi ahụ m ga-eme ka ọ dakwasị ha.”’+
18 “N’ihi na nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Dị nnọọ ka m wụkwasịrị ndị bi na Jeruselem iwe m na ọnụma m,+ otú ahụ ka m ga-awụkwasị unu ọnụma m maka na unu banyere Ijipt, unu ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ na ihe ijuanya na ihe nkọcha na ihe ịkwa emo,+ unu agaghịkwa ahụ ebe a ọzọ.’+
19 “Unu ndị Juda fọdụrụnụ, Jehova ekwuwo okwu megide unu. Unu abanyela Ijipt.+ Unu ga-amara na mụ agbawo akaebe megide unu taa,+ 20 na unu ejehiewo megide mkpụrụ obi unu;+ n’ihi na ọ bụ unu ziri m ka m gakwuru Jehova bụ́ Chineke unu, sị, ‘Kpekuoro anyị Jehova bụ́ Chineke anyị ekpere; gwa anyị ihe ọ bụla Jehova bụ́ Chineke anyị kwuru, anyị ga-eme ya.’+ 21 M na-agwa unu taa, ma unu agaghị erube isi n’ihe Jehova bụ́ Chineke unu kwuru ma ọ bụ mee ihe ọ bụla o ziri m ka m gwa unu.+ 22 Maranụ na mma agha+ na ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-egbu unu n’ebe ahụ na-atọ unu ụtọ ịbanye gaa biri dị ka ndị ọbịa.”+