33 Jeenụ ije n’ụzọ+ niile Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu n’iwu, ka unu wee dị ndụ, ka ihe wee gaziere unu,+ ka ụbọchị unu ga-ebi n’ala ahụ unu ga-enweta wee dịkwa ogologo.
3 Nụrụ, Izrel, leziekwa anya idebe+ ha, ka ihe wee gaziere gị,+ ka unu wee dị nnọọ ọtụtụ, dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke nna nna gị hà kwere gị ná nkwa,+ banyere ala ahụ nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.
23 Ma, ọ bụ iwu a ka m nyere ha, sị: “Rubenụ isi n’ihe m kwuru,+ m ga-abụ Chineke unu,+ unu ga-abụkwa ndị m; jeenụ ije n’ụzọ dum+ m ga-enye unu iwu ka unu soro, ka ihe wee gaziere unu.”’+