19 Hezekaya bụ́ eze Juda na ndị Juda niile hà gburu ya? Ọ́ tụghị egwu Jehova wee mee ka obi Jehova jụrụ,+ nke mere na Jehova gbanwere obi ya n’ọdachi o kwuru ga-adakwasị ha?+ Ya mere, anyị na-akpatara mkpụrụ obi anyị oké ọdachi.+
18 Olee Chi dị ka gị,+ onye na-agbaghara njehie, nke na-agbaghakwara mmebi iwu+ nke ndị fọdụrụ n’ihe nketa ya?+ Ọ gaghị na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na obiọma* na-atọ ya ụtọ.+