Ndị Ikpe 2:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Mgbe Jehova nyekwara ha onyeikpe,+ Jehova na-anọnyere onyeikpe ahụ, ọ na-azọpụtakwa ha n’aka ndị iro ha n’ụbọchị niile nke onyeikpe ahụ; n’ihi na ọ na-ewute Jehova+ na ha na-asụ ude n’ihi ndị na-emegbu ha+ na ndị na-akwagharị ha. Abụ Ọma 90:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Jehova, biko, lọta!+ Ọ̀ ga-abụ ruo ole mgbe?+Nweekwa mwute n’ihi ndị ohu gị.+ Abụ Ọma 106:45 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 45 N’ihi ha, ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya,+Ọ na-agbanwe obi ya dị ka oké obiọma ya si dị ukwuu.+ Abụ Ọma 135:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 N’ihi na Jehova ga-ekpechite ọnụ ndị ya,+Ọ ga-enwekwa ọmịiko n’ebe ndị ohu ya nọ.+
18 Mgbe Jehova nyekwara ha onyeikpe,+ Jehova na-anọnyere onyeikpe ahụ, ọ na-azọpụtakwa ha n’aka ndị iro ha n’ụbọchị niile nke onyeikpe ahụ; n’ihi na ọ na-ewute Jehova+ na ha na-asụ ude n’ihi ndị na-emegbu ha+ na ndị na-akwagharị ha.