19 Mmadụ niile wee malite ịgwa Samuel, sị: “Kpekuo Jehova bụ́ Chineke gị ekpere+ maka ndị ohu gị, n’ihi na anyị achọghị ịnwụ; n’ihi na anyị atụkwasịwo ihe ọjọọ n’elu mmehie anyị niile site n’ịrịọ ka e nye anyị eze.”
4 Ma eleghị anya, Jehova bụ́ Chineke gị ga-anụ ihe Rabshake kwuru,+ onye eze Asiria onyenwe ya zitere ka ọ kwaa Chineke dị ndụ emo,+ ọ ga-emekwa ka ọ zaa ajụjụ maka okwu Jehova bụ́ Chineke gị nụrụ.+ Kpeekwa ekpere+ maka ndị fọdụrụnụ.’”+
16 Ya mere, na-ekwupụtanụ+ mmehie unu gwa ibe unu, na-ekpekwaranụ ibe unu ekpere, ka e wee gwọọ unu.+ Ekpere nke onye ezi omume na-ekpesi ike dị ike nke ukwuu mgbe ọ na-akpa ike.+