11 Ọ ga-abata bibie ala Ijipt.+ Onye ọ bụla ajọ ọrịa ga-egbu, ajọ ọrịa ga-egbu ya, onye ọ bụla a ga-adọrọ n’agha, a ga-adọrọ ya n’agha, onye ọ bụla mma agha ga-egbu, mma agha ga-egbu ya.+
11 “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Kụọ aka+ ma zọsie ụkwụ ike n’ala, sịkwa: “Ewoo!” n’ihi ajọ ihe arụ niile nke ụlọ Izrel,+ n’ihi na ọ bụ mma agha,+ ụnwụ+ na ọrịa na-efe efe ka a ga-eji gbuo ha.+