16 Ọ ga-eweta ihe iji kwụọ ụgwọ maka mmehie o mere megide ebe nsọ ahụ, ọ ga-atụkwasịkwa ya otu ụzọ n’ụzọ ise+ nke ihe o wetara, ọ ga-enyekwa ya onye nchụàjà, ka onye nchụàjà wee were ebule àjà ikpe ọmụma kpuchiere ya mmehie ya,+ a ga-agbaghara ya.+
5 ma ọ bụ ihe ọ bụla ọ ṅụrụ iyi ụgha na ya, ọ ga-akwụcha ụgwọ ya,+ ọ ga-atụkwasịkwa ya otu ụzọ n’ụzọ ise nke ihe ahụ. Ọ ga-enye ya onye nwe ya n’ụbọchị e gosipụtara na ikpe mara ya.
19 Ma ọ bụrụ na e nwee ka onye ahụ doro ubi ya nsọ si chọọ ịgbara ya, ọ ga-atụkwasị n’elu ya otu ụzọ n’ụzọ ise nke ego ole e kpebiri n’elu ego ole ahụ e kpebiri, ọ ga-aghọrịrị nke ya.+