15 Ma mkpụrụ obi ọ bụla nke riri anụ nwụworo anwụ ma ọ bụ nke anụ ọhịa dọgburu,+ ma ọ̀ bụ nwa afọ ma ọ bụ mbịarambịa, ọ ga-asụ uwe ya, saakwa ahụ́ na mmiri wee bụrụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede;+ ọ ga-aghọkwa onye dị ọcha.
21 “Unu erila anụ ọ bụla nwụrụ anwụ.+ I nwere ike inye ya onye mbịarambịa nke bi n’obodo gị, ọ ga-eri ya; ma ọ bụ, a pụrụ iresị ya onye mba ọzọ, n’ihi na unu bụ ndị dị nsọ nye Jehova bụ́ Chineke unu.
14 M wee sị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova! Lee! E merụghị mkpụrụ obi m emerụ;+ eritụbeghị m anụ nwụrụ anwụ ma ọ bụ anụ a dọgburu adọgbu malite n’oge m bụ nwata,+ ọbụna ruo ugbu a, anụ rụrụ arụ abatụbeghị m n’ọnụ.”+