15 N’otu ụbọchị ahụ ka ị ga-enye ya ụgwọ ọrụ ya,+ ị ga-ewere ya nye ya tupu anyanwụ adaa, n’ihi na ọ nọ ná nsogbu, ọ bụkwa ụgwọ ọrụ ya ka mkpụrụ obi ya chekwubere; ka o wee ghara itiku Jehova n’ihi gị,+ ọ ga-aghọkwara gị mmehie.+
13 “Ahụhụ ga-adịrị onye na-ejighị ezi omume na-ewu ụlọ ya,+ onye na-ejighịkwa ikpe ziri ezi na-ewu ọnụ ụlọ ya n’elu ya, site n’ime ka mmadụ ibe ya rụọ ọrụ n’efu, n’akwụghị ya ụgwọ;+
4 Lee! Ụgwọ nke unu kwesịrị ịkwụ ndị ọrụ bụ́ ndị weere unu ihe ubi, nke unu na-ekweghị akwụ ha,+ na-eti mkpu,+ mkpu enyemaka+ nke ndị na-ewe ihe ubi na-eti eruwokwa Jehova nke ụsụụ ndị agha ntị.+