9 “‘Nwoke dị ọcha ga-ekporo ntụ+ nne ehi ahụ kposa ná mpụga ebe unu mara ụlọikwuu n’ebe dị ọcha; a ga-edebere ya nzukọ ụmụ Izrel maka mmiri ahụ e ji eme ka mmadụ dị ọcha.+ Ọ bụ àjà mmehie.
23 ihe ọ bụla a na-eji ọkụ anụcha+ ka unu ga-etinye n’ọkụ, ọ ga-adịkwa ọcha. Ma a ga-eji mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha mee ka ọ dị ọcha.+ Unu ga-eji mmiri sachaa+ ihe ọ bụla a na-ejighị ọkụ anụcha.