33 Mozis wee nye ụmụ Gad+ na ụmụ Ruben+ na ọkara ebo Manase+ nwa Josef ala nke Saịhọn+ bụ́ eze Amọraịt chịrị na ala nke Ọg+ bụ́ eze Beshan chịrị, ya bụ, ala nke obodo ndị dị n’ókèala ha, tinyere obodo ndị gbara ala ahụ gburugburu.
22 “I wee nye ha alaeze dị iche iche+ na ndị dị iche iche, keekwa ha ná mpaghara ná mpaghara;+ ha wee nweta ala nke Saịhọn,+ bụ́ ala nke eze Heshbọn,+ nakwa ala nke Ọg+ eze Beshan.+