32 Lia wee tụrụ ime mụọ nwa nwoke wee gụọ ya Ruben,+ n’ihi na ọ sịrị: “Ọ bụ maka na Jehova ahụwo ọnọdụ ọjọọ m,+ n’ihi na ugbu a, di m ga-amalite ịhụ m n’anya.”
5Ụmụ Ruben+ bụ́ ọkpara Izrel—n’ihi na ọ bụ ya bụ ọkpara;+ ma n’ihi na Ruben merụrụ ihe ndina nna ya,+ e weere ihe ruuru ya dị ka ọkpara nye ụmụ Josef+ nwa Izrel, nke mere na e debaghị aha ya n’akwụkwọ usoro ọmụmụ dị ka ihe ruuru ya dị ka ọkpara si dị.