22 Ruben wee gaa n’ihu ịsị ha: “Unu awụfula ọbara.+ Tụbanụ ya n’olulu mmiri a nke dị n’ala ịkpa, unu emerụla ya ahụ́.”+ O bu n’obi ịnapụta ya n’aka ha ka o wee kpọghachiri ya nna ya.
5Ụmụ Ruben+ bụ́ ọkpara Izrel—n’ihi na ọ bụ ya bụ ọkpara;+ ma n’ihi na Ruben merụrụ ihe ndina nna ya,+ e weere ihe ruuru ya dị ka ọkpara nye ụmụ Josef+ nwa Izrel, nke mere na e debaghị aha ya n’akwụkwọ usoro ọmụmụ dị ka ihe ruuru ya dị ka ọkpara si dị.