7 Ka iwe ha bụrụ ihe a bụrụ ọnụ,+ n’ihi na ọ jọgburu onwe ya,+ ka oké iwe ha bụrụkwa ihe a bụrụ ọnụ, n’ihi na ọ naghị eme ebere.+ Ka m kesaa ha na Jekọb, ka m meekwa ka ha gbasasịa n’Izrel.+
18“Ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, ya bụ, ebo Livaị dum, agaghị enweta òkè ma ọ bụ ihe nketa ọ bụla n’Izrel.+ Àjà Jehova nke a na-esure n’ọkụ, bụ́ ihe nketa ya, ka ha ga na-eri.+
4 N’ihi na ụmụ Josef ghọrọ ebo abụọ,+ Manase+ na Ifrem;+ ha enyeghịkwa ndị Livaị òkè n’ala ahụ, ma e wezụga obodo+ ndị ha ga-ebi nakwa ala ịta ahịhịa ha maka anụ ụlọ ha na ihe onwunwe ha.+
2 ha wee gwa ha okwu na Shaịlo+ n’ala Kenan, sị: “Jehova nyere iwu site n’ọnụ Mozis ka e nye anyị obodo anyị ga-ebi, tinyere ala ebe anụ ụlọ anyị ga na-ata ahịhịa.”+