12 “Ọ ga-erukwa na, n’ihi na unu na-ege ntị ná mkpebi ikpe ndị a, na-edebekwa ha ma na-eme ha,+ Jehova bụ́ Chineke gị ga-edebere gị ọgbụgba ndụ+ na obiọma, bụ́ ndị ọ ṅụụrụ nna nna gị hà n’iyi.+
10 “‘Ezitere m ọrịa na-efe efe n’etiti unu, ụdị nke rịara Ijipt.+ Eji m mma agha gbuo ụmụ okorobịa unu,+ dọrọkwa ịnyịnya unu n’agha.+ Emekwara m ka ísì ọjọọ nke na-esi n’ebe unu mara ụlọikwuu siba unu n’imi;+ ma unu alọghachikwuteghị m,’+ ka Jehova kwuru.