26 ana m ewere eluigwe na ụwa+ dị ka ndị akaebe megide unu taa, na unu ga-alarịrị n’iyi ọsọ ọsọ pụọ n’ala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta. Ụbọchị unu ga-ebi na ya agaghị adị ọtụtụ, n’ihi na a ga-alarịrị unu n’iyi.+
19 Eluigwe na ụwa bụ ndị akaebe m megide unu taa,+ na edebewo m ndụ na ọnwụ n’ihu unu,+ ngọzi+ na nkọcha;+ ị ga-ahọrọkwa ndụ ka i wee dịrị ndụ,+ gị na ụmụ gị,+