18 Ma n’ime ụmụ Ruben na ndị Gad na ọkara ebo Manase, ndị dike,+ bụ́ ndị ikom na-ebu ọta na mma agha na ndị na-ekwe ụta, ndị e nyere ọzụzụ ịlụ agha, dị puku mmadụ iri anọ na anọ na narị asaa na iri isii bụ́ ndị na-aga agha.+
20 E wee nyere ha aka ibuso ha agha, nke mere na e nyefere ndị Hega na ndị niile ha na ha so n’aka ha, n’ihi na ha kpọkuru Chineke maka enyemaka+ n’agha ahụ, o wee nabata arịrịọ ha n’ihi na ha tụkwasịrị ya obi.+