18 Ugwu Saịnaị dum wee na-akwụ anwụrụ ọkụ,+ n’ihi na Jehova ji ọkụ gbadata na ya;+ anwụrụ ọkụ si na ya wee na-akwụgo dị ka anwụrụ ọkụ si n’ekwú ọkụ,+ ugwu ahụ dum nọkwa na-ama jijiji nke ukwuu.+
23 “O wee ruo na ozugbo unu nụrụ olu ahụ nke si n’etiti ọchịchịrị ahụ kwuo okwu, ka ugwu ahụ nọ na-ere ọkụ,+ unu bịara m nso, ya bụ, ndị isi niile nke ebo unu na ndị okenye unu.