26“‘Unu emerela onwe unu chi na-abaghị uru,+ unu eguzobekwarala onwe unu ihe oyiyi a pịrị apị+ ma ọ bụ ogidi nsọ, unu edebela nkume a tụrụ ihe oyiyi na ya+ n’ala unu ka unu na-akpọ isiala n’ihu ya;+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.
16 ka unu wee ghara ime omume na-eweta mbibi,+ gharakwa imere onwe unu ihe oyiyi a pịrị apị, ọdịdị nke ihe oyiyi ọ bụla, ihe yiri nwoke ma ọ bụ nwaanyị,+
23 Lezienụ anya ka unu ghara ichefu ọgbụgba ndụ Jehova bụ́ Chineke unu, nke unu na ya gbara,+ ka unu gharakwa imere onwe unu ihe oyiyi a pịrị apị, ọdịdị nke ihe ọ bụla Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị iwu banyere ya.+
15 “‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke mere ihe oyiyi a pịrị apị+ ma ọ bụ ihe oyiyi a wụrụ awụ,+ bụ́ ihe arụ n’anya Jehova,+ ọrụ aka nke onye na-eji osisi na ígwè arụ ọrụ,+ onye debewokwara ya n’ebe zoro ezo.’ (Mmadụ niile ga-aza, sị, ‘Amen!’)+