10 Ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike nye Jehova bụ́ Chineke gị.+ Arụla ọrụ ọ bụla, gị onwe gị ma ọ bụ nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị, ohu gị nwoke ma ọ bụ ohu gị nwaanyị ma ọ bụ anụ ụlọ gị ma ọ bụ onye mbịarambịa nke bi n’obodo gị.+
12 “Ụbọchị isii ka ị ga-arụ ọrụ gị;+ ma n’ụbọchị nke asaa, arụla ọrụ, ka ehi gị na ịnyịnya ibu gị wee zuo ike, ka nwa ohu gị nwaanyị na onye mbịarambịa wee nweta ume.+