14 “‘Ọ bụrụkwa na onye mbịarambịa bi n’etiti unu dị ka ọbịa, ya onwe ya kwa ga-akwadebe àjà ememme ngabiga a na-emere Jehova.+ Dị ka ụkpụrụ ememme ngabiga na usoro ya si dị ka ọ ga-eme ya.+ Otu ụkpụrụ ga-adịrị unu, ọ ga-adịrị ma onye mbịarambịa ma nwa afọ ala unu.’”+