Jenesis 9:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Ma unu erikọtala+ anụ na mkpụrụ obi ya+—ọbara ya.+ Levitikọs 3:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 “‘Ọ bụ ụkpụrụ dịịrị ọgbọ unu niile ruo mgbe a na-akaghị aka, n’ebe niile unu ga-ebi: unu erila abụba ọ bụla ma ọ bụ ọbara ọ bụla+ ma ọlị.’” Levitikọs 7:26 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 26 “‘Unu erila ọbara ọ bụla+ n’ebe ọ bụla unu bi, ma ọ̀ bụ nke anụ ufe ma ọ bụ nke anụ ọhịa. Levitikọs 19:26 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 26 “‘Unu erikọtala ihe ọ bụla na ọbara.+ “‘Unu achọla ihe mgbaàmà maka ọdịnihu,+ unu emekwala anwansi.+ Diuterọnọmi 12:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 Ọ bụ naanị ọbara ya ka ị na-agaghị eri.+ N’ala ka ị ga-awụpụ ya dị ka mmiri.+ 1 Samuel 14:33 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 33 Ha wee gwa Sọl, sị: “Lee! Ndị Izrel na-emehie Jehova site n’irikọta anụ na ọbara ha.”+ O wee sị: “Unu emewo omume aghụghọ. Burugodịnụ ụzọ kwatara m otu nnukwu nkume.” Ọrụ Ndịozi 15:29 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 29 ya bụ, ịdị na-ezere ihe e ji chụọrọ arụsị àjà,+ na ọbara+ na anụ a nyagburu anyagbu+ na ịkwa iko.+ Ọ bụrụ na unu elezie anya zere ihe ndị a,+ ọ ga-adịrị unu mma. Nọrọnụ nke ọma!”
17 “‘Ọ bụ ụkpụrụ dịịrị ọgbọ unu niile ruo mgbe a na-akaghị aka, n’ebe niile unu ga-ebi: unu erila abụba ọ bụla ma ọ bụ ọbara ọ bụla+ ma ọlị.’”
26 “‘Unu erikọtala ihe ọ bụla na ọbara.+ “‘Unu achọla ihe mgbaàmà maka ọdịnihu,+ unu emekwala anwansi.+
33 Ha wee gwa Sọl, sị: “Lee! Ndị Izrel na-emehie Jehova site n’irikọta anụ na ọbara ha.”+ O wee sị: “Unu emewo omume aghụghọ. Burugodịnụ ụzọ kwatara m otu nnukwu nkume.”
29 ya bụ, ịdị na-ezere ihe e ji chụọrọ arụsị àjà,+ na ọbara+ na anụ a nyagburu anyagbu+ na ịkwa iko.+ Ọ bụrụ na unu elezie anya zere ihe ndị a,+ ọ ga-adịrị unu mma. Nọrọnụ nke ọma!”