Ọpụpụ 13:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 Jehova ji ogidi ígwé ojii na-ebutere ha ụzọ n’ehihie, jirikwa ogidi ọkụ na-ebutere ha ụzọ n’abalị iji duru ha na-aga,+ iji na-enye ha ìhè ha ga-eji na-aga n’ehihie nakwa n’abalị.+ Ọpụpụ 40:36 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 36 Mgbe ígwé ojii ahụ si n’ụlọikwuu ahụ kwụlie, ụmụ Izrel na-akwali na njem niile ha mere ná nkebi ná nkebi.+ Ọnụ Ọgụgụ 10:34 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 34 Ígwé ojii+ Jehova nọkwa n’elu isi ha n’ehihie ka ha si n’ebe ha mara ụlọikwuu na-apụ. Nehemaya 9:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 Ọ bụkwa ogidi ígwé ojii ka i ji duo ha n’ehihie,+ jirikwa ogidi ọkụ duo ha n’abalị,+ inye ha ìhè+ n’ụzọ ha kwesịrị iso. Abụ Ọma 78:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 O wee jiri ígwé ojii na-edu ha n’ehihie,+Jirikwa ìhè ọkụ na-edu ha ogologo abalị dum.+ Abụ Ọma 105:39 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 39 Ọ gbasapụrụ ígwé ojii ka o kpuchie ha,+Nyekwa ha ọkụ ka ọ na-enye ha ìhè n’abalị.+
21 Jehova ji ogidi ígwé ojii na-ebutere ha ụzọ n’ehihie, jirikwa ogidi ọkụ na-ebutere ha ụzọ n’abalị iji duru ha na-aga,+ iji na-enye ha ìhè ha ga-eji na-aga n’ehihie nakwa n’abalị.+
36 Mgbe ígwé ojii ahụ si n’ụlọikwuu ahụ kwụlie, ụmụ Izrel na-akwali na njem niile ha mere ná nkebi ná nkebi.+
12 Ọ bụkwa ogidi ígwé ojii ka i ji duo ha n’ehihie,+ jirikwa ogidi ọkụ duo ha n’abalị,+ inye ha ìhè+ n’ụzọ ha kwesịrị iso.