8 Mgbe unu na-eweta anụmanụ kpuru ìsì maka ịchụ àjà: “Ọ bụghị ihe ọjọọ.” Mgbe unu na-ewetakwa anụmanụ dara ngwọrọ ma ọ bụ nke na-arịa ọrịa: “Ọ bụghị ihe ọjọọ.”’”+
“Biko, werenụ ya gaa nye gọvanọ unu. Ihe unu ọ̀ ga-adị ya mma, ka ọ̀ ga-eji obiọma nabata unu?” ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.