27 Ndị bụ́ ezinụlọ Kohat bụ ezinụlọ ụmụ Amram na ezinụlọ ụmụ Izha na ezinụlọ ụmụ Hibrọn na ezinụlọ ụmụ Ọziel. Ọ bụ ezinụlọ ndị a bụ ezinụlọ ụmụ Kohat.+
28 N’ime ndị niile bụ́ ụmụ nwoke, malite ná ndị ruru otu ọnwa gbagowe, e nwere puku mmadụ asatọ na narị isii, bụ́ ndị na-arụ ọrụ e kwesịrị ịrụ n’ebe nsọ ahụ.+
31 Ọrụ+ ha bụ ịhụ maka Igbe+ ahụ na tebụl+ ahụ na ihe ndọba oriọna+ ahụ na ebe ịchụàjà+ ndị ahụ na arịa+ ndị dị n’ebe nsọ ahụ, bụ́ ndị ha ga-eji na-eje ozi, tinyere ákwà ngebichi ahụ,+ nakwa ozi niile metụtara ya.