10 Unu ga-agafekwa Jọdan+ ma biri n’ala ahụ nke Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu,+ ọ ga-emekwa ka unu zuoro ndị iro niile gbara unu gburugburu ike, unu ga-ebikwa n’obi iru ala.+
19 Ọ ga-erukwa na mgbe Jehova bụ́ Chineke gị mere ka i zuoro ndị iro niile gbara gị gburugburu ike n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka ọ bụrụ nke gị dị ka ihe nketa,+ ị ga-ekpochapụ Amalek ka a ghara ịkpọtụkwa ha aha n’okpuru eluigwe.+ Echefula.