14 Jehova wee sị Mozis: “Dee ihe a n’akwụkwọ+ ka ọ bụrụ ihe ncheta, kwuokwa ya ná ntị Jọshụa, ‘M ga-ehichapụ ihe niile a pụrụ iji na-echeta Amalek n’okpuru eluigwe.’”+
3 Gaa gbuo ndị Amalek+ ma laa ha na ihe niile ha nwere n’iyi,+ enwekwarala ha ọmịiko, gbuo ha,+ ma nwoke ma nwaanyị, ma nwatakịrị ma nwa na-aṅụ ara,+ ma ehi ma atụrụ, ma kamel ma ịnyịnya ibu.’”+
3Mgbe ihe ndị a gasịrị, Eze Ahazuirọs mere ka Heman+ nwa Hamedeta onye agbụrụ Egag+ dị ukwuu, o bulikwara ya n’ọkwá+ ma mee ka ọkwá ya dị elu karịa ndị isi ndị ọzọ ya na ha nọ.+