14 Jehova wee sị Mozis: “Dee ihe a n’akwụkwọ+ ka ọ bụrụ ihe ncheta, kwuokwa ya ná ntị Jọshụa, ‘M ga-ehichapụ ihe niile a pụrụ iji na-echeta Amalek n’okpuru eluigwe.’”+
19 Ọ ga-erukwa na mgbe Jehova bụ́ Chineke gị mere ka i zuoro ndị iro niile gbara gị gburugburu ike n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka ọ bụrụ nke gị dị ka ihe nketa,+ ị ga-ekpochapụ Amalek ka a ghara ịkpọtụkwa ha aha n’okpuru eluigwe.+ Echefula.
3 Gaa gbuo ndị Amalek+ ma laa ha na ihe niile ha nwere n’iyi,+ enwekwarala ha ọmịiko, gbuo ha,+ ma nwoke ma nwaanyị, ma nwatakịrị ma nwa na-aṅụ ara,+ ma ehi ma atụrụ, ma kamel ma ịnyịnya ibu.’”+