7 Eze Ahazuirọs wee gwa Esta nwunye ya na Mọdekaị bụ́ onye Juu, sị: “Lee! Enyewo m Esta+ ụlọ Heman, ha akwụwala Heman n’osisi,+ n’ihi na o setịrị aka ya megide ndị Juu.
24 N’ihi na Heman+ nwa Hamedeta,+ onye agbụrụ Egag,+ bụ́ onye na-ebuso ndị Juu niile iro,+ akpawo nkata megide ndị Juu ibibi ha,+ o mewokwa ka e fee Pua,+ ya bụ, Nza,+ iji tinye ọgba aghara n’etiti ha ma bibie ha.