21 Ọ bụkwa n’ihu Elieza onye nchụàjà ka ọ ga na-eguzo, ọ ga na-ajụtara ya ase+ n’ihu Jehova site ná mkpebi ikpe nke Yurim.+ Ọ bụ ya ga na-agwa ha mgbe ha ga na-apụ na mgbe ha ga na-abata, ya na ụmụ Izrel niile na nzukọ ahụ dum.”
28 Mee Jọshụa onye ndú,+ gbaakwa ya ume ma mee ka ọ dị ike, n’ihi na ọ bụ ya ga-ebutere ndị a ụzọ mgbe ha na-agafe,+ ọ bụkwa ya ga-eme ka ha nweta ala ahụ ị ga-ahụ.’+