24 N’ihi na otu ụzọ n’ụzọ iri nke ụmụ Izrel ga na-enye Jehova dị ka onyinye ka m nyere ndị Livaị ka ọ bụrụ ihe nketa ha. Ọ bụ ya mere m ji sị ha, ‘Ha agaghị enweta ihe nketa+ n’etiti ụmụ Izrel.’”
62 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha wee dịrị puku mmadụ iri abụọ na atọ, ndị ikom niile malite ná ndị dị otu ọnwa gbagowe.+ N’ihi na e debaghị aha ha n’akwụkwọ mgbe e debara aha ụmụ Izrel,+ n’ihi na ọ dịghị ihe nketa a ga-enye ha n’etiti ụmụ Izrel.+
18“Ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, ya bụ, ebo Livaị dum, agaghị enweta òkè ma ọ bụ ihe nketa ọ bụla n’Izrel.+ Àjà Jehova nke a na-esure n’ọkụ, bụ́ ihe nketa ya, ka ha ga na-eri.+