6 M ga-eme ka udo dị n’ala unu,+ unu ga-edinakwa ala n’enweghị onye ga-eme ka unu maa jijiji;+ m ga-eme ka a ghara inwekwa ajọ anụ ọhịa n’ala unu,+ mma agha agaghịkwa agabiga n’ala unu.+
23 Jọshụa wee weghara ala ahụ dum, dị ka ihe niile Jehova kwere Mozis ná nkwa si dị,+ Jọshụa wee nye ya Izrel ka ọ bụrụ ihe nketa ha n’òkè n’òkè, dị ka ebo ha si dị.+ Ala ahụ enweghị nsogbu agha ọzọ.+