14Nke a bụ ala ụmụ Izrel nwetara dị ka ihe nketa n’ala Kenan,+ nke Elieza onye nchụàjà na Jọshụa nwa Nọn na ndị isi nke ndị bụ́ nna n’ebo dị iche iche nke ụmụ Izrel mere ka ha keta.+
16Ala ụmụ Josef+ ketara site n’ife nza+ bidoro na Jọdan,+ nke dị nso na Jeriko, ruo na mmiri Jeriko, n’ebe ọwụwa anyanwụ, ruo n’ala ịkpa nke si na Jeriko gbagoo n’ógbè Betel+ nke bụ́ ugwu ugwu.
17Nza+ e fere wee daara ebo Manase,+ n’ihi na ọ bụ ọkpara Josef,+ ọ bụ Mekia+ bụ́ ọkpara Manase, nna Gilied,+ ka ọ daara n’ihi na ọ bụ dike n’agha;+ Gilied+ na Beshan wee bụrụ nke ya.