23 Jọshụa wee weghara ala ahụ dum, dị ka ihe niile Jehova kwere Mozis ná nkwa si dị,+ Jọshụa wee nye ya Izrel ka ọ bụrụ ihe nketa ha n’òkè n’òkè, dị ka ebo ha si dị.+ Ala ahụ enweghị nsogbu agha ọzọ.+
14Nke a bụ ala ụmụ Izrel nwetara dị ka ihe nketa n’ala Kenan,+ nke Elieza onye nchụàjà na Jọshụa nwa Nọn na ndị isi nke ndị bụ́ nna n’ebo dị iche iche nke ụmụ Izrel mere ka ha keta.+