20 Ndị Izrel wee tie mkpu mgbe ha fụrụ opi.+ O wee ruo na ozugbo ha nụrụ ụda opi, ndị mmadụ malitekwa iti oké mkpu agha, mgbidi ahụ daruru ala.+ Ha wee banye n’obodo ahụ, onye ọ bụla n’ebe o chere ihu, wee weghara obodo ahụ.
26 Jọshụa wee kwupụta ọbụbụ ọnụ n’oge ahụ, sị: “Ka onye ga-ebili wuo obodo a, bụ́ Jeriko, bụrụ onye a bụrụ ọnụ n’ihu Jehova. Ka ịtọ ntọala ya rie isi ọkpara ya, ka itinye ibo ụzọ ya riekwa isi ọdụdụ nwa ya.”+