Ọnụ Ọgụgụ 27:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 Ọ bụkwa n’ihu Elieza onye nchụàjà ka ọ ga na-eguzo, ọ ga na-ajụtara ya ase+ n’ihu Jehova site ná mkpebi ikpe nke Yurim.+ Ọ bụ ya ga na-agwa ha mgbe ha ga na-apụ na mgbe ha ga na-abata, ya na ụmụ Izrel niile na nzukọ ahụ dum.” Ndị Ikpe 20:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Ha wee bilie gbagoo Betel ịjụ Chineke ase.+ Ụmụ Izrel wee sị: “Ònye n’ime anyị ga-ebute ụzọ n’agha anyị ga-ebuso ụmụ Benjamin?”+ Jehova wee zaa, sị: “Juda ga-ebute ụzọ.”+ Ilu 3:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi,+ adaberekwala ná nghọta gị.+
21 Ọ bụkwa n’ihu Elieza onye nchụàjà ka ọ ga na-eguzo, ọ ga na-ajụtara ya ase+ n’ihu Jehova site ná mkpebi ikpe nke Yurim.+ Ọ bụ ya ga na-agwa ha mgbe ha ga na-apụ na mgbe ha ga na-abata, ya na ụmụ Izrel niile na nzukọ ahụ dum.”
18 Ha wee bilie gbagoo Betel ịjụ Chineke ase.+ Ụmụ Izrel wee sị: “Ònye n’ime anyị ga-ebute ụzọ n’agha anyị ga-ebuso ụmụ Benjamin?”+ Jehova wee zaa, sị: “Juda ga-ebute ụzọ.”+