2 Sọl wee si n’etiti Izrel họpụtara onwe ya puku ndị ikom atọ; Sọl na puku ndị ikom abụọ wee nọrọ na Mikmash+ nakwa n’ógbè Betel nke bụ́ ugwu ugwu, Jọnatan+ na otu puku ndị ikom nọkwa na Gibia+ nke Benjamin, o wee gwa ndị fọdụrụ n’etiti ha ka ha laa, onye ọ bụla n’ụlọikwuu ya.