5 “‘N’ụbọchị niile ọ bụ onye Naziraịt dị ka nkwa o kwere si dị, agụba agaghị emetụ ya n’isi;+ ruo mgbe oge e doro ya iche nye Jehova ga-ezu, ọ ga-abụ onye dị nsọ site n’ịhapụ ntutu+ isi ya ka o too eto.
5 N’ihi na, lee! ị ga-atụrụ ime, ị ga-amụkwa nwa nwoke, agụba ọ bụla agaghị emetụ ya n’isi,+ n’ihi na onye Naziraịt+ nke Chineke ka nwa ahụ ga-abụ ozugbo o si n’afọ pụta;+ ọ bụkwa ya ga-ebute ụzọ n’ịzọpụta Izrel n’aka ndị Filistia.”+
15 n’ihi na ọ ga-abụ onye ukwu n’ihu Jehova.+ Ma ọ gaghị aṅụ mmanya na ihe ọṅụṅụ ọ bụla na-egbu egbu ma ọlị,+ ọ ga-ejupụtakwa na mmụọ nsọ malite n’afọ nne ya;+