5 Ị ga-achịrị uwe+ ndị ahụ yiwe Erọn uwe mwụda ahụ na uwe na-enweghị aka nke efọd ahụ na efọd ya na akpa obi ahụ, ị ga-ejikwa eriri efọd ahụ kesie ya ike n’úkwù.+
21 Ọ bụkwa n’ihu Elieza onye nchụàjà ka ọ ga na-eguzo, ọ ga na-ajụtara ya ase+ n’ihu Jehova site ná mkpebi ikpe nke Yurim.+ Ọ bụ ya ga na-agwa ha mgbe ha ga na-apụ na mgbe ha ga na-abata, ya na ụmụ Izrel niile na nzukọ ahụ dum.”