Levitikọs 26:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Unu ga-achụkwa ndị iro unu ọsọ,+ ha ga-adakwa n’ihu unu site ná mma agha. Joshụa 23:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Naanị otu onye n’etiti unu ga-achụ otu puku mmadụ ọsọ,+ n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu na-eburu unu agha,+ dị nnọọ ka o kwere unu ná nkwa.+ Abụ Ọma 44:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 N’ihi na ọ bụghị mma agha ha ka ha ji nweta ala ahụ,+Ọ bụghịkwa ogwe aka ha wetaara ha nzọpụta.+N’ihi na ọ bụ aka nri gị na ogwe aka gị+ nakwa ìhè nke ihu gị,N’ihi na ihe ha masịrị gị.+ Ndị Rom 8:31 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 31 Gịnịzi ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a? Ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, ònye ga-emegide anyị?+
10 Naanị otu onye n’etiti unu ga-achụ otu puku mmadụ ọsọ,+ n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu na-eburu unu agha,+ dị nnọọ ka o kwere unu ná nkwa.+
3 N’ihi na ọ bụghị mma agha ha ka ha ji nweta ala ahụ,+Ọ bụghịkwa ogwe aka ha wetaara ha nzọpụta.+N’ihi na ọ bụ aka nri gị na ogwe aka gị+ nakwa ìhè nke ihu gị,N’ihi na ihe ha masịrị gị.+