Ọpụpụ 23:27 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 27 “M ga-ezipụ ụjọ m n’ihu gị,+ m ga-etinye ndị niile ị ga-abata n’etiti ha n’ọgba aghara, n’ezie, m ga-eme ka ndị iro gị niile si n’ihu gị gbaa ọsọ.+ Diuterọnọmi 3:22 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 22 Unu atụkwala ha egwu, n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu na-eburu unu agha.’+ Diuterọnọmi 20:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu so unu na-eje ije iburu unu agha megide ndị iro unu ka o wee zọpụta unu.’+ Ndị Rom 8:31 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 31 Gịnịzi ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a? Ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, ònye ga-emegide anyị?+
27 “M ga-ezipụ ụjọ m n’ihu gị,+ m ga-etinye ndị niile ị ga-abata n’etiti ha n’ọgba aghara, n’ezie, m ga-eme ka ndị iro gị niile si n’ihu gị gbaa ọsọ.+
4 n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu so unu na-eje ije iburu unu agha megide ndị iro unu ka o wee zọpụta unu.’+