5 Ma ndị Filistia zukọtara ibuso Izrel agha, ya bụ, ụgbọ ịnyịnya+ agha ndị dị iri atọ na puku mmadụ isii ndị na-agba ịnyịnya nakwa ndị dị ọtụtụ dị ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri;+ ha wee gbagoo malite ịma ụlọikwuu na Mikmash n’ebe ọwụwa anyanwụ Bet-even.+