11 “Olee uru ọtụtụ àjà unu na-achụ baara m?” ka Jehova kwuru. “Àjà ebule+ a na-esurecha n’ọkụ+ nakwa abụba nke anụ mara abụba+ agbụla m; ọbara+ nwa oké ehi na nke nwa ebule na nke mkpi+ adịghịkwa atọ m ụtọ.+
6 Olee ihe m ga-eji gakwuru+ Jehova? Olee ihe m ga-eji kpọọrọ Chineke nke nọ n’elu isiala?+ M̀ ga-eji àjà a na-esurecha n’ọkụ gakwuru ya,+ m̀ ga-eji ụmụ ehi ndị gbara otu afọ?