12 Anyị adịkwaghị agwa unu okwu ọma+ banyere onwe anyị, kama anyị na-enye unu ihe ga-akpali unu iji anyị na-anya isi,+ ka unu wee nwee ihe unu ga-aza ndị na-anya isi n’ihi otú mmadụ dị n’elu ahụ́+ kama ịnya isi n’ihi otú obi mmadụ dị.+
7 Unu na-ele ihe anya otú ha dị n’anya.+ Ọ bụrụ na onye ọ bụla atụkwasị onwe ya obi na ya bụ nke Kraịst, ya chebara ihe a echiche ọzọ n’onwe ya, na otú ahụ ọ bụ nke Kraịst, otú ahụ ka anyị bụkwa.+