2 Ihe E Mere 20:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 O wee sị: “Geenụ ntị, Juda dum na unu ndị bi na Jeruselem, tinyere Eze Jehọshafat! Nke a bụ ihe Jehova gwara unu, ‘Unu atụla egwu,+ unu amakwala jijiji n’ihi nnukwu ìgwè mmadụ a; n’ihi na agha a abụghị nke unu, kama ọ bụ nke Chineke.+ Abụ Ọma 46:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Jehova nke ụsụụ ndị agha nọnyeere anyị;+Chineke Jekọb bụụrụ anyị ebe dị elu e wusiri ike.+ Sila. Ilu 21:31 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 31 Ịnyịnya bụ ihe a kwadebere maka ụbọchị agha,+ ma, ọ bụ Jehova nwe nzọpụta.+
15 O wee sị: “Geenụ ntị, Juda dum na unu ndị bi na Jeruselem, tinyere Eze Jehọshafat! Nke a bụ ihe Jehova gwara unu, ‘Unu atụla egwu,+ unu amakwala jijiji n’ihi nnukwu ìgwè mmadụ a; n’ihi na agha a abụghị nke unu, kama ọ bụ nke Chineke.+