25 Ọ bụ Amesa+ ka Absalọm họpụtara ka ọ nọchie Joab+ ịbụ onyeisi ndị agha; Amesa bụ nwa otu nwoke aha ya bụ Itra+ onye Izrel, bụ́ onye ya na Abigel+ nwa Nehash, nwanne Zeruya, nne Joab, nwere mmekọahụ.
13 Gwakwanụ Amesa, sị,+ ‘Ọ̀ bụ na mụ na gị abụghị otu ọkpụkpụ na otu anụ ahụ́? Ka Chineke mee m otú a, ka ọ tụkwasịkwa ihe na ya+ ma ọ bụrụ na ị gaghị abụ onyeisi ndị agha n’ihu m mgbe niile n’ọnọdụ Joab.’”+