2 Samuel 12:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Gịnị mere i ji leghara okwu Jehova anya site n’ime ihe jọrọ njọ+ n’anya ya? I ji mma agha gbuo Yuraya onye Het,+ i wee kpọrọ nwunye ya ka ọ bụrụ nwunye gị,+ ma i ji mma agha nke ụmụ Amọn gbuo ya. Abụ Ọma 51:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Chineke bụ́ Chineke nke nzọpụta m,+ biko, napụta m n’ikpe ọmụma ọbara,+Ka ire m wee jiri ọṅụ na-akọ banyere ezi omume gị.+ Ilu 3:29 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 29 Akparala mmadụ ibe gị nkata ihe ọjọọ ọ bụla,+ mgbe o chere na gị na ya bi n’udo.+ Ilu 17:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Onye ọ bụla nke na-eji ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọma,+ ihe ọjọọ agaghị apụ n’ụlọ ya.+ Zekaraya 8:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 Unu akpala nkata n’ime obi unu ịkpatara ibe unu ọdachi,+ unu ahụkwala iyi ụgha n’anya;+ n’ihi na m kpọrọ ihe ndị a niile asị,’+ ka Jehova kwuru.” Mak 7:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 n’ihi na ọ bụ n’ime mmadụ, n’obi ụmụ mmadụ,+ ka echiche ọjọọ dị iche iche si apụta: ịkwa iko,+ izu ohi, igbu ọchụ,+
9 Gịnị mere i ji leghara okwu Jehova anya site n’ime ihe jọrọ njọ+ n’anya ya? I ji mma agha gbuo Yuraya onye Het,+ i wee kpọrọ nwunye ya ka ọ bụrụ nwunye gị,+ ma i ji mma agha nke ụmụ Amọn gbuo ya.
14 Chineke bụ́ Chineke nke nzọpụta m,+ biko, napụta m n’ikpe ọmụma ọbara,+Ka ire m wee jiri ọṅụ na-akọ banyere ezi omume gị.+
17 Unu akpala nkata n’ime obi unu ịkpatara ibe unu ọdachi,+ unu ahụkwala iyi ụgha n’anya;+ n’ihi na m kpọrọ ihe ndị a niile asị,’+ ka Jehova kwuru.”
21 n’ihi na ọ bụ n’ime mmadụ, n’obi ụmụ mmadụ,+ ka echiche ọjọọ dị iche iche si apụta: ịkwa iko,+ izu ohi, igbu ọchụ,+