52 Chụpụnụ ndị niile bi n’ala ahụ n’ihu unu ma bibie ihe oyiyi niile ha ji nkume mee,+ bibiekwanụ ihe oyiyi niile ha ji ígwè wụọ,+ laakwanụ ebe nsọ ha niile dị elu n’iyi.+
2 Unu ga-ebibicha+ ebe niile mba ndị unu na-anapụ ala ha na-anọ efe chi ha, ya bụ, n’ugwu dị elu na n’obere ugwu dị iche iche nakwa n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ.+
43 O wee na-eje ije n’ụzọ niile Esa nna ya jere. Ọ hapụghị ya, site n’ime ihe ziri ezi n’anya Jehova.+ Ọ bụ naanị na e bibighị ebe ndị dị elu. Ndị mmadụ ka na-achụ àjà ma na-esure ihe nsure ọkụ n’ebe ndị dị elu.+